2 Kings 7

1Ịlaisha zara sị ya, a “Nụrụ okwu Onyenwe anyị. Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, b Nʼoge dịka mgbe a echi, a ga-ere otu akpa nta ụtụ ọka otu shekel, rekwaa akpa nta ọka balị abụọ otu shekel nʼọnụ ụzọ ama obodo Sameria.”

2Ọchịagha ahụ, nke eze na-adabere nʼaka ya, sịrị onye nke Chineke, “Lee, a sịkwarị na Onyenwe anyị emeghee oghere idee nke eluigwe, nke a ọ pụrụ ime?”

Ma Ịlaisha zara ya, “Ị ga-eji anya gị abụọ hụ ya, ma ị gaghị eri site nʼime ya.”

Ọgbaaghara nʼogige agha ndị Sameria

3Nʼoge a, e nwere ndị ekpenta
Onye ọbụla na-arịa ọrịa ekpenta a gaghị ebi nʼime obodo nʼetiti ụmụ mmadụ. Lev 13:45-46; Ọnụ 5:2-4; 12:10.
anọ nọ nʼezi mgbidi gbara Sameria gburugburu, nʼakụkụ ọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka anyị nọ nʼebe a na-eme? Ọ bụ ka anyị nọrọ nʼebe a tutu anyị anwụọ?
4Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Anyị ga-abanye nʼime obodo,’ ụnwụ dị nʼebe ahụ, anyị ga-anwụkwa. Ọ bụrụkwanụ na anyị anọgide nʼebe a anyị ga-anwụ. Ya mere ka anyị gafeenụ banye nʼọmụma ụlọ ikwu ndị agha Aram, were onwe anyị nyefee ha nʼaka. Ọ bụrụ na ha edebe anyị ndụ, anyị ga-adị ndụ, ọ bụrụ na ha egbuo anyị, anyị ga-anwụkwa.”

5Nʼoge uhuruchi, ha biliri gaa nʼọmụma ụlọ ikwu ndị agha Aram. Mgbe ha bịarutere nʼọnụ ụlọ ikwu ahụ, o nwekwaghị onye nọ nʼebe ahụ, 6nʼihi na Onyenwe anyị mere ka ndị Aram nụ ụzụ ụgbọ agha na nke ịnyịnya, na nke usuu ndị agha. Nke a mere ka onye ọbụla gwa ibe ya sị, “Lee, eze ndị Izrel egoola ndị agha ndị Het, na ndị eze Ijipt ibuso anyị agha.” 7Ha biliri gbapụ ọsọ nʼabalị ahụ, hapụ ụlọ ikwu ha niile, na ịnyịnya ha niile, na ịnyịnya ibu ha niile, na ihe niile otu o si dịrị, ma gbapụ ọsọ ndụ.

8Mgbe ndị ekpenta ahụ rutere ogige ndị agha ndị Siria, ha banyere nʼime otu ụlọ rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ dị nʼime ya. Ha chịịrị ọlaọcha na ọlaedo na uwe ọma niile dị nʼime ya gaa zoo ha. Ọzọkwa, ha lọghachiri banye nʼụlọ ọzọ kwakọrọ ụfọdụ ihe dị nʼime ya gaa zoo.

9Ma mgbe ahụ ha sịrịtara onwe ha, “Ihe anyị na-eme ezighị ezi. Taa bụ ụbọchị oziọma, ma lee ka anyị na-agba nkịtị. Ọ bụrụ na anyị echere ruo ìhè ụtụtụ, a ga-achọpụta ajọọ omume anyị. Ugbu a bịanụ, ka anyị gaa gwa ndị nọ nʼụlọeze, ihe anyị hụrụ.”

10Ya mere, ha gara kpọkuo ndị nche ọnụ ụzọ obodo ahụ, gwa ha sị, “Anyị banyere nʼogige ndị agha Aram, o nweghị mmadụ ọbụla nọ nʼebe ahụ, ọ dịghị olu mmadụ anyị nụrụ nʼebe ahụ, naanị ịnyịnya na ịnyịnya ibu elibere nʼosisi, na ụlọ ikwu ha a hapụrụ dịka ha dị.” 11Ndị na-eche nche tiri mkpu kọọrọ ndị nọ nʼụlọeze ihe mere.

12Eze biliri nʼabalị ahụ gwa ndịisi ọrụ ya sị, “Ka m gwa unu ihe ndị Aram mere anyị. Ha maara na anyị nọ nʼoke agụụ, nʼihi ya, ha akpacharala anya hapụ ọmụma ụlọ ikwu ha gaa zoo onwe ha nʼime ọhịa. Echiche ha bụ, ‘Ndị a ga-apụtarịrị, mgbe ahụ, anyị ga-ejide ha na ndụ, banyekwa nʼime obodo ha.’ ”

13Ma otu onye nʼime ndịisi agha ya zara sị ya, “Ka ụfọdụ mmadụ duru ịnyịnya ise ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo. Ọ bụrụ na ndị a alọtaghị ọnọdụ ha ga-adị ka nke ndị Izrel niile fọdụrụ nʼebe, e, ha ga-adị ka ndị Izrel niile a gụrụ dịka ndị nwụrụ anwụ. Ya mere, ka anyị zipụ ha ka ha gaa chọpụta ihe mere.”

14Ya mere, ha họpụtara ụgbọ agha abụọ na ịnyịnya ndị na-adọkpụ ha. Eze zipụrụ ha ịchụso ndị agha Aram, O nyere ndị na-agba ha iwu sị, “Gaanụ chọpụta ihe mere.” 15Ha sogidere ha ruo nʼosimiri Jọdan. Nʼakụkụ ụzọ niile jupụtara nʼuwe na ngwa agha ndị agha Aram tufuru mgbe ha na-eme ngwangwa. Ndị ahụ e zipụrụ lọghachiri bịa kọọrọ eze ihe ha hụrụ. 16Ndị Izrel niile pụrụ gaa kwakọrọ ihe dị nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Aram. Nke bụ na e rere otu akpa nta ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma otu shekel, rekwaa akpa ọka balị abụọ otu shekel dịka Onyenwe anyị si kwuo.

17Eze họpụtara ọchịagha ahụ, nke ọ na-adabere nʼaka ya, nye ya ọrụ ilekọta ọnụ ụzọ obodo ahụ. Ma ndị si nʼobodo na-enupụta nuturu ya, zọọ ya ụkwụ, zọgbuo ya mgbe ha na-agbapụta.
Amụma ahụ mezuru nʼisi ọchịagha eze dịka e kwuru ya. 2Ez 7:2
Ọ nwụrụ dịka Ịlaisha onye nke Chineke kwuru mgbe eze bịakwutere ya ụnyaahụ, ijide ya.
18Ihe niile mezuru dịka onye nke Chineke gwara eze okwu sị ya, “A ga-ere akpa nta ọka balị abụọ otu shekel na otu akpa nta ụtụ ọka otu shekel, nʼọnụ ụzọ ama Sameria.”

19Nʼoge ahụ, ọchịagha ahụ na-ejere eze ozi zara sị ya, “Ihe dị otu a agaghị eme, ọ bụladị na Onyenwe anyị emeghee eluigwe mee ka nri zoo, nke a ọ ga-eme?” Ma onye nke Chineke zara ya, “Ị ga-eji anya gị hụ ya, ma ị gaghị eso rie ya.” 20Ọ bụkwa otu a ka o si mee, nʼihi na ndị mmadụ zọgburu ya nʼụkwụ nʼọnụ ụzọ ama, ebe ọ nọ nwụọ.

Copyright information for IboBIU